Izikiel 38

“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼala Magog, bukwaa amụma megide Gog, bụ onyeisi nke Meshek na Tubal. Buo amụma megide ya,

Ezekiel 38:2 (UKJV) Son of man, set your face against Gog, the land of Magog, the chief prince of Meshech and Tubal, and prophesy against him,

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼala Magog, bukwaa amụma megide Gog, bụ onyeisi nke Meshek na Tubal. Buo amụma megide ya,

3sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m edo onwe m imegide gị, Gog, eze ukwu ndị Meshek na Tubal.

4Aga m echigharị gị, tinye gị nko nʼagba gị abụọ, jiri ya kpụpụta gị na usuu ndị agha gị niile, na ịnyịnya gị, na ndị na-agba ịnyịnya gị na ihe agha ha, na usuu ndị agha gị niile, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ndị niile na-ejide mma agha ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.