10Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
11“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m enye Gog ebe olili ya nʼIzrel, nʼime ndagwurugwu si ọwụwa anyanwụ gawa nʼụzọ oke osimiri. Ọ ga-anọchi ụzọ ndị ije nʼihi na ebe ahụ ka a ga-eli Gog na usuu ndị agha ya. Ya mere, a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Hamọn Gog.
12“ ‘Ọnwa asaa ka ọ ga-ewe ndị Izrel ili ozu ahụ niile, ime ka ala ahụ dị ọcha.
13Ndị niile nke ala ahụ ga-eli ha, ụbọchị ahụ m ga-eme ka ebube m pụta ìhè ga-abụ ụbọchị ihe ncheta nye ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
14A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala. “ ‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị.