Izikiel 39

Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha.

Ezekiel 39:15 (UKJV) And the passengers that pass through the land, when any sees a man's bone, then shall he set up a sign by it, till the buriers have buried it in the valley of Hamongog.

13Ndị niile nke ala ahụ ga-eli ha, ụbọchị ahụ m ga-eme ka ebube m pụta ìhè ga-abụ ụbọchị ihe ncheta nye ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

14A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala. “ ‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị.

15Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha.

16Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’

17“Nwa nke mmadụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, kpọọ ụmụ nnụnụ niile oku, na anụ ọhịa niile dị iche iche, sị ha, ‘Chịkọtaanụ onwe unu, site nʼakụkụ niile bịanụ nʼọchụchụ aja m, nke mụ onwe m na-achụ nʼihi unu, bụ aja dị ukwuu nke m na-achụ nʼelu ugwu niile dị nʼIzrel. Nʼebe ahụ ka unu ga-anọ taa anụ, ṅụọkwa ọbara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.