18Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan.
19Unu ga-erijukwa abụba afọ, ṅụbigakwa ọbara oke ruo mgbe ọ ga-ebu unu, site nʼaja mmemme nke m na-achụ nʼihi unu.
20Afọ anụ ịnyịnya, na ụgbọala, na nke ndị dike, na nke ndị agha niile ga-eju unu na tebul m.’ Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
21“Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha.
22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.