22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.
23Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.
24Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ.
25“Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ.
26Ha ga-echezọkwa ihe ihere ha, na-ekwesighị ntụkwasị obi ha niile, nke ha gosiri m, mgbe ha biri nʼudo nʼala ha, na-enweghị onye na-eme ka ha tụọ egwu.