Izikiel 39

“Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ.

Ezekiel 39:25 (UKJV) Therefore thus says the Lord GOD; Now will I bring again the captivity of Jacob, and have mercy upon the whole house of Israel, and will be jealous for my holy name;

23Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.

24Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ.

25“Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ.

26Ha ga-echezọkwa ihe ihere ha, na-ekwesighị ntụkwasị obi ha niile, nke ha gosiri m, mgbe ha biri nʼudo nʼala ha, na-enweghị onye na-eme ka ha tụọ egwu.

27Mgbe m mere ka ha site na mba dị iche iche pụta, mgbe m sitere nʼala niile nke ndị iro ha kpọpụta ha, aga m esite na ha gosi ịdị nsọ m nye mba dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.