Izikiel 40

O mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama mbata nke ugwu. Ọ tụrụ ya, chọpụta na ọtụtụ ya dịkwa ka nke ndị ọzọ,

Ezekiel 40:35 (UKJV) And he brought me to the north gate, and measured it according to these measures;

33Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya niile bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.

34Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.

35O mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama mbata nke ugwu. Ọ tụrụ ya, chọpụta na ọtụtụ ya dịkwa ka nke ndị ọzọ,

36dịka ọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya, ha niile nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ

37Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.