34Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
35O mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama mbata nke ugwu. Ọ tụrụ ya, chọpụta na ọtụtụ ya dịkwa ka nke ndị ọzọ,
36dịka ọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya, ha niile nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ
37Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
38Otu ọnụụlọ nke nwere ọnụ ụzọ dịkwa nʼakụkụ mpụta ọnụ ụlọ nke ime ime ọnụ ụzọ ama ọbụla, ebe a na anọ asacha anụ aja nsure ọkụ niile.