Izikiel 40

Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.

Ezekiel 40:37 (UKJV) And the posts thereof were toward the utter court; and palm trees were upon the posts thereof, on this side, and on that side: and the going up to it had eight steps.

35O mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama mbata nke ugwu. Ọ tụrụ ya, chọpụta na ọtụtụ ya dịkwa ka nke ndị ọzọ,

36dịka ọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya, ha niile nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ

37Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.

38Otu ọnụụlọ nke nwere ọnụ ụzọ dịkwa nʼakụkụ mpụta ọnụ ụlọ nke ime ime ọnụ ụzọ ama ọbụla, ebe a na anọ asacha anụ aja nsure ọkụ niile.

39Nʼime mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ka tebul abụọ dị nʼotu akụkụ, abụọ nke ọzọ dịkwa nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụlọ ahụ. Nʼelu ha ka a na-egbu anụ e ji achụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja mmehie, maọbụ onyinye nʼihi aja ikpe ọmụma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.