43E ji nko nke ịdị ogologo ya dị sentimita itoolu ejigidesi tebul ndị ahụ ike nʼahụ aja ụlọ. Nko ndị a dị gburugburu tebul ndị ahụ. Ọ bụkwa nʼelu tebul ndị a ka a na-edebe anụ niile e ji enye onyinye.
44Nʼime ogige dị nʼime, e nwere ọnụụlọ abụọ nke nwere ụzọ e si abanye nʼogige dị nʼime. Otu dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, chee ihu nʼọdịda anyanwụ, nke ọzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼọdịda anyanwụ, chee ihu nʼugwu.
45Ọ gwara m, “Ọnụụlọ ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu bụ nke ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
46Ọnụụlọ nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama chere ihu nʼugwu, bụ nke ndị nchụaja ndị na-eche ebe ịchụ aja nche. Ndị a bụ ụmụ ụmụ Zadọk. Ọ bụ naanị ha ka e kwere ka ha nwee ike ịbịaru Onyenwe anyị nso, ijere ya ozi site nʼetiti ebo Livayị niile.”
47Mgbe ahụ, ọ tụrụ ogige ime ahụ, chọpụta na ogologo ya dị iri mita ise na asatọ. Obosara ya bụkwa otu ihe ahụ. Ebe ịchụ aja dịkwa nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ.