Izikiel 41

Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara.

Ezekiel 41:3 (UKJV) Then went he inward, and measured the post of the door, two cubits; and the door, six cubits; and the breadth of the door, seven cubits.

1Mgbe ahụ, nwoke ahụ kpọbatara m nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ọnụ ụzọ ya. Akụkụ ya ọbụla dị mita atọ na ụma abụọ, nke a bụ obosara ụlọ ikwu ahụ.

2Obosara ọnụ ụzọ mbata ya dị mita ise na ụma atọ. Akụkụ aja abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dịkwa mita abụọ na ụma asaa. Ọ tụkwara ogologo ụlọ ezumezu ahụ; ya dịrị iri mita abụọ na otu nʼogologo, obosara ya dị mita iri na otu.

3Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara.

4Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.”

5Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.