Izikiel 41

Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi.

Ezekiel 41:5 (UKJV) After he measured the wall of the house, six cubits; and the breadth of every side chamber, four cubits, round about the house on every side.

3Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara.

4Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.”

5Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi.

6Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.

7E wuru ọnụụlọ nta ndị a ka obosara ọnụụlọ ndị ahụ niile dị nʼelu ibe ha dị ukwuu karịa obosara ndị nke dị nʼokpuru ha. Nʼụzọ dị otu a, obosara ọnụụlọ niile dị nʼokpukpu nke abụọ dị ukwuu karịa nke dị nʼala; nke atọ dịkwa ukwuu karịa nke abụọ. E wukwara ebe e si arịgo site nʼokpukpu nke dịkarịsịrị ala rigoruo nʼọnụụlọ ndị kachasị elu, site nʼokpukpu nke dị nʼetiti.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.