13Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ime ọnụụlọ niile dị nʼugwu, na ime ọnụụlọ ndị dị na ndịda, bụ ndị a chere ogige ụlọnsọ ahụ ihu, bụ ime ụlọ dị nsọ, nke ndị nchụaja. Ebe ndị nchụaja ndị na-abịa nso Onyenwe anyị ịchụ aja ga-anọ rie nri niile nke kachasị nsọ, nʼebe ahụ ka ha ga-edebekwa aja ịnata ihuọma, aja mmehie na aja ikpe ọmụma, nʼihi na ụlọ ndị a dị nsọ.
14Mgbe ndị nchụaja bara nʼime ebe nsọ ahụ nke e kewapụrụ iche, ha aghaghị esikwa nʼebe ahụ pụta nʼogige mpụta ezi, tupu ruo mgbe ha yisara uwe ha yii jee ozi, nʼihi na uwe ndị a dị nsọ. Ha ga-eyiri uwe ọzọ, tupu ha abanye nʼakụkụ ụlọ ndị ahụ dịịrị ndị ọzọ.”
15Mgbe ọ tụchara ihe ndị dị nʼime ebe ụlọnsọ ahụ, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼọwụwa anyanwụ pụta, tụkwaa nʼakụkụ niile gburugburu.
16O ji ihe ọtụtụ dị ogologo tụọ akụkụ ọwụwa anyanwụ, ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
17O ji mkpirisi osisi ahụ e ji atụ ihe tụọ akụkụ nke ugwu ma chọpụta na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.