Izikiel 42

Ụlọ ahụ nke ọnụ ụzọ ya chere ihu nʼebe ugwu dị iri mita ise na atọ nʼogologo, ebe obosara ya dị iri mita abụọ na asaa.

Ezekiel 42:2 (UKJV) Before the length of an hundred cubits was the north door, and the breadth was fifty cubits.

1Nwoke ahụ duuru m gaa nʼakụkụ ugwu, banye nʼime ogige ahụ dị nʼezi, kpọbata m nʼime ọnụụlọ ndị ahụ dị na ncherita ihu nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.

2Ụlọ ahụ nke ọnụ ụzọ ya chere ihu nʼebe ugwu dị iri mita ise na atọ nʼogologo, ebe obosara ya dị iri mita abụọ na asaa.

3Ma nʼakụkụ nke dị iri mita na otu, site nʼime ogige nakwa nʼakụkụ nke dị na ncherita ihu pevumentị nke ogige dị nʼezi, ebe njegharị chere ebe njegharị ọzọ ihu, nʼokpukpu atọ ahụ.

4Nʼihu ọnụụlọ ndị a, e nwere ka ụzọ njegharị nke dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. Ọnụ ụzọ ha niile chere ihu nʼugwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.