18Ọ tụkwara akụkụ nke ndịda, chọpụtakwa na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
19Mgbe ahụ, ọ tụgharịrị jirikwa ihe ọtụtụ ahụ tụọkwa akụkụ nke ọdịda anyanwụ. Ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
20Ya mere, ọ tụrụ akụkụ anọ niile nke ebe ahụ. Mgbidi gbara ya gburugburu. Ọtụtụ ha dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, nʼogologo, obosara ya dịkwa ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, iji kewapụta ebe dị nsọ site nʼebe ndị ọzọ.