Izikiel 42

Ebe a na-ejighị ogidi wuo ụlọ a, dịka e si wuo ndị dị nʼogige, nke a mere ka ụlọ ndị dị nʼelu na-akpa nkpa karịa ndị nke dị nʼala, na ndị dị nʼetiti.

Ezekiel 42:6 (UKJV) For they were in three stories, but had not pillars as the pillars of the courts: therefore the building was straitened more than the low and the middlemost from the ground.

4Nʼihu ọnụụlọ ndị a, e nwere ka ụzọ njegharị nke dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. Ọnụ ụzọ ha niile chere ihu nʼugwu.

5Okpukpu ụlọ nke dị nʼelu asaghị mbara dịka nke dị nʼala, nʼihi na ebe njegharị ndị ahụ weere ọtụtụ oghere karịa ka ọ dị nʼọnụụlọ ndị dị okpukpu nke dị nʼala na nke etiti ụlọ ahụ.

6Ebe a na-ejighị ogidi wuo ụlọ a, dịka e si wuo ndị dị nʼogige, nke a mere ka ụlọ ndị dị nʼelu na-akpa nkpa karịa ndị nke dị nʼala, na ndị dị nʼetiti.

7E nwere mgbidi aja nke dị nʼezi nʼakụkụ ọnụụlọ niile, nʼụzọ ogige nke dị nʼezi. Ọ mapụtara nʼihu ọnụụlọ ndị ahụ, ogologo ihe dị iri mita abụọ na asaa.

8Nʼọtụtụ ogologo ọnụụlọ ndị a, ndị dị nso nʼogige mpụta, ruru mita iri abụọ na itoolu, ebe ogologo ndị nke dịkarịsịrị nso ebe nsọ ahụ, ruru mita iri ise na asatọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.