Izikiel 42

Nʼọtụtụ ogologo ọnụụlọ ndị a, ndị dị nso nʼogige mpụta, ruru mita iri abụọ na itoolu, ebe ogologo ndị nke dịkarịsịrị nso ebe nsọ ahụ, ruru mita iri ise na asatọ.

Ezekiel 42:8 (UKJV) For the length of the chambers that were in the utter court was fifty cubits: and, lo, before the temple were an hundred cubits.

6Ebe a na-ejighị ogidi wuo ụlọ a, dịka e si wuo ndị dị nʼogige, nke a mere ka ụlọ ndị dị nʼelu na-akpa nkpa karịa ndị nke dị nʼala, na ndị dị nʼetiti.

7E nwere mgbidi aja nke dị nʼezi nʼakụkụ ọnụụlọ niile, nʼụzọ ogige nke dị nʼezi. Ọ mapụtara nʼihu ọnụụlọ ndị ahụ, ogologo ihe dị iri mita abụọ na asaa.

8Nʼọtụtụ ogologo ọnụụlọ ndị a, ndị dị nso nʼogige mpụta, ruru mita iri abụọ na itoolu, ebe ogologo ndị nke dịkarịsịrị nso ebe nsọ ahụ, ruru mita iri ise na asatọ.

9Nʼokpuru ọnụụlọ ndị a, e nwere ụzọ mbata nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka mmadụ na-abata ha site nʼogige dị na mpụta.

10Nʼakụkụ ndịda, nʼogologo aja ụlọ dị nʼogige mpụta, nke dị nʼakụkụ ogige ụlọnsọ ukwu, nke chere aja ụlọ mpụta ihu, ọtụtụ ọnụụlọ dị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.