Izikiel 43

“Nke a bụ ọtụtụ niile gbasara ebe ịchụ aja ya: Ịdị elu nke ala ya bụ iri sentimita ise na atọ; ịgba gburugburu nke ọnụ ya bụ iri sentimita abụọ na atọ; obosara ya dị iri sentimita ise na atọ. Otu a ka ebe ịchụ aja ahụ ga-aha nʼogologo.

Ezekiel 43:13 (UKJV) And these are the measures of the altar after the cubits: The cubit is a cubit and an hand breadth; even the bottom shall be a cubit, and the breadth a cubit, and the border thereof by the edge thereof round about shall be a span: and this shall be the higher place of the altar.

11Ọ bụrụ nʼezie na ihere emee ha nʼihi ihe ha mere, mgbe ahụ, kọwaara ha ihe niile metụtara otu a ga-esi wuo ụlọnsọ a, na ihe gbasara nkwado ya, na ihe gbasara ọnụ ụzọ ọpụpụ na mbata ya niile, ihe metụtara ebumnobi nke owuwu ya niile na usoro na iwu niile banyere ya. Depụta ihe ndị a nʼihu ha, nye ha ka ha lezie anya mezuo ihe niile metụtara usoro a ga-agbaso wuo ya.

12“Nke a bụ iwu ụlọ banyere nsọ ukwu ahụ. Ebe niile gbara elu ugwu a gburugburu ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ! Nke a bụ iwu ụlọnsọ ahụ.

13“Nke a bụ ọtụtụ niile gbasara ebe ịchụ aja ya: Ịdị elu nke ala ya bụ iri sentimita ise na atọ; ịgba gburugburu nke ọnụ ya bụ iri sentimita abụọ na atọ; obosara ya dị iri sentimita ise na atọ. Otu a ka ebe ịchụ aja ahụ ga-aha nʼogologo.

14Site nʼụkwụ ya nke dị nʼala ruo nʼokere ya nke etiti, ọ ga-adị otu mita nʼogologo nakwa nʼuhie; site nʼokere nke nta ruo na nke ukwu ga-adị mita abụọ nʼogologo na ọkara nʼuhie.

15Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita abụọ, mpi anọ sikwa nʼakụkụ ya gbagoo elu, nke ọbụla nʼime ha ga-adị ọkara mita nʼogologo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.