Izikiel 43

Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita abụọ, mpi anọ sikwa nʼakụkụ ya gbagoo elu, nke ọbụla nʼime ha ga-adị ọkara mita nʼogologo.

Ezekiel 43:15 (UKJV) So the altar shall be four cubits; and from the altar and upward shall be four horns.

13“Nke a bụ ọtụtụ niile gbasara ebe ịchụ aja ya: Ịdị elu nke ala ya bụ iri sentimita ise na atọ; ịgba gburugburu nke ọnụ ya bụ iri sentimita abụọ na atọ; obosara ya dị iri sentimita ise na atọ. Otu a ka ebe ịchụ aja ahụ ga-aha nʼogologo.

14Site nʼụkwụ ya nke dị nʼala ruo nʼokere ya nke etiti, ọ ga-adị otu mita nʼogologo nakwa nʼuhie; site nʼokere nke nta ruo na nke ukwu ga-adị mita abụọ nʼogologo na ọkara nʼuhie.

15Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita abụọ, mpi anọ sikwa nʼakụkụ ya gbagoo elu, nke ọbụla nʼime ha ga-adị ọkara mita nʼogologo.

16Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita isii nʼogologo na mita isii nʼuhie, nwee akụkụ anọ nke ha nʼotu.

17Nke dị nʼokpuru ga-adị mita asatọ nʼakụkụ ọbụla; a ga-arụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu, ka ịdị elu nke ọnụ ọnụ ya bụrụ iri sentimita abụọ na asaa. Akụkụ ya niile gbasapụrụ site nʼelu ya ruo nʼala. Ọtụtụ mgbasapụ a dị iri sentimita ise na atọ. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ka ihe e ji arịgo ya dị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.