Izikiel 43

Nke dị nʼokpuru ga-adị mita asatọ nʼakụkụ ọbụla; a ga-arụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu, ka ịdị elu nke ọnụ ọnụ ya bụrụ iri sentimita abụọ na asaa. Akụkụ ya niile gbasapụrụ site nʼelu ya ruo nʼala. Ọtụtụ mgbasapụ a dị iri sentimita ise na atọ. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ka ihe e ji arịgo ya dị.”

Ezekiel 43:17 (UKJV) And the settle shall be fourteen cubits long and fourteen broad in the four squares thereof; and the border about it shall be half a cubit; and the bottom thereof shall be a cubit about; and his stairs shall look toward the east.

15Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita abụọ, mpi anọ sikwa nʼakụkụ ya gbagoo elu, nke ọbụla nʼime ha ga-adị ọkara mita nʼogologo.

16Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita isii nʼogologo na mita isii nʼuhie, nwee akụkụ anọ nke ha nʼotu.

17Nke dị nʼokpuru ga-adị mita asatọ nʼakụkụ ọbụla; a ga-arụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu, ka ịdị elu nke ọnụ ọnụ ya bụrụ iri sentimita abụọ na asaa. Akụkụ ya niile gbasapụrụ site nʼelu ya ruo nʼala. Ọtụtụ mgbasapụ a dị iri sentimita ise na atọ. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ka ihe e ji arịgo ya dị.”

18Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị a bụ usoro metụtara iwu ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ifesa ọbara nʼelu ebe ịchụ aja mgbe e wusiri ya.

19Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị Livayị si nʼezinaụlọ Zadọk, bụ ndị na-abịa m nso ife ofufe nʼihu m, otu oke ehi maka aja mmehie, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.