1Emesịa, ọ kpọbatakwara m nʼọnụ ụzọ mbata nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.
2Ma lee, ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-apụta. Olu ya dị ka mbigbọ nke ebili mmiri, ebube ya nwukwara nʼala ahụ niile.
3Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
4Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ.