Izikiel 43

Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m.

Ezekiel 43:6 (UKJV) And I heard him speaking unto me out of the house; and the man stood by me.

4Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ.

5Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m bubata m nʼime ogige nke ime, ma ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ahụ.

6Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m.

7Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ebe a bụ ebe nke ocheeze, na ebe nke ọbụ ụkwụ m abụọ ga-anọgide, ebe a ka m ga-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Ụlọ Izrel agaghị emerụkwa aha nsọ m ọzọ, ha onwe ha maọbụ ndị eze ha, site nʼikpere arụsị niile ha na ibubata onyinye olili ozu ndị eze ha, mgbe ha nwụrụ anwụ.

8Mgbe ha wuru mbata ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ mbata ọnụ ụzọ m, tinye ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ ọnụ ụzọ m, ọ bụkwa naanị mgbidi bụ ihe dị nʼetiti mụ na ha. Ha merụrụ aha nsọ m site nʼihe arụ niile ha mere. Ya mere m ji bibie ha nʼiwe m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.