3Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
4Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ.
5Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m bubata m nʼime ogige nke ime, ma ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
6Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m.
7Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ebe a bụ ebe nke ocheeze, na ebe nke ọbụ ụkwụ m abụọ ga-anọgide, ebe a ka m ga-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Ụlọ Izrel agaghị emerụkwa aha nsọ m ọzọ, ha onwe ha maọbụ ndị eze ha, site nʼikpere arụsị niile ha na ibubata onyinye olili ozu ndị eze ha, mgbe ha nwụrụ anwụ.