18“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ ọbụla, unu ga-ewere nwa oke ehi nke na-enweghị ntụpọ, chụọ aja ido ụlọnsọ m nsọ.
19Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara nke aja mmehie ahụ tee ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ m, na nʼakụkụ anọ nke ọnụ ebe ịchụ aja, na nʼahụ ibo nke ọnụ ụzọ ogige ime.
20Unu ga-emekwa otu ihe ahụ nʼabalị asaa nke ọnwa ahụ nʼihi onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maka ikpuchi mmehie metụtara ụlọnsọ m.
21“ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka unu ga-edebe Mmemme Ngabiga. Ọ ga-abụ mmemme abalị asaa. Nʼụbọchị ndị a, naanị achịcha nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ka unu ga-eri.
22Nʼụbọchị ahụ, onyeisi ga-eweta otu nwa oke ehi maka aja mmehie nke onwe ya, na maka mmehie mmadụ niile nke ala ahụ.