Izikiel 46

Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ.

Ezekiel 46:10 (UKJV) And the prince in the midst of them, when they go in, shall go in; and when they go forth, shall go forth.

8Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.

9“ ‘Ma mgbe ndị ala ahụ ga-abata nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme dị nsọ, onye ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu bata aghaghị ịpụ site nʼọnụ ụzọ nke dị na ndịda. Ndị si na ndịda bata ga-esitekwa nʼụzọ nke ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi nʼụzọ o si bata laghachi, kama ha ga-esi ụzọ nke chere ebe ha si bata ihu pụọ.

10Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ.

11Nʼoge mmemme ndị ahụ pụrụ iche, na mmemme ndị akara aka, ihe a ga-eji nye onyinye mkpụrụ ọka ga-abụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu oke ehi, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ na otu ebule, tinyere ụmụ atụrụ nke ọnụọgụgụ ya ga-abụ dịka o si masị ya, tinyere lita mmanụ asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ọbụla.

12“ ‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.