Izikiel 46

“ ‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara.

Ezekiel 46:12 (UKJV) Now when the prince shall prepare a voluntary burnt offering or peace offerings voluntarily unto the LORD, one shall then open him the gate that looks toward the east, and he shall prepare his burnt offering and his peace offerings, as he did on the sabbath day: then he shall go forth; and after his going forth one shall shut the gate.

10Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ.

11Nʼoge mmemme ndị ahụ pụrụ iche, na mmemme ndị akara aka, ihe a ga-eji nye onyinye mkpụrụ ọka ga-abụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu oke ehi, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ na otu ebule, tinyere ụmụ atụrụ nke ọnụọgụgụ ya ga-abụ dịka o si masị ya, tinyere lita mmanụ asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ọbụla.

12“ ‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara.

13“ ‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya.

14Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.