Izikiel 46

Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.

Ezekiel 46:8 (UKJV) And when the prince shall enter, he shall go in by the way of the porch of that gate, and he shall go forth by the way thereof.

6Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla.

7Ọ ga-ewetakwa otu oke ehi na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ, maka aja mkpụrụ ọka. Ọ ga-enye ebule ahụ na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ. Ọ ga-enyekwa ụmụ atụrụ ndị ahụ na ụtụ ọka dịka o si masị ya inye ha, tinyere iri lita ọka abụọ na abụọ, nke ọ ga-eweta maka lita mmanụ oliv asaa.

8Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.

9“ ‘Ma mgbe ndị ala ahụ ga-abata nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme dị nsọ, onye ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu bata aghaghị ịpụ site nʼọnụ ụzọ nke dị na ndịda. Ndị si na ndịda bata ga-esitekwa nʼụzọ nke ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi nʼụzọ o si bata laghachi, kama ha ga-esi ụzọ nke chere ebe ha si bata ihu pụọ.

10Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.