1“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọnụ ụzọ ama nke ogige ime, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ ga-abụ ihe e mechiri emechi nʼụbọchị isii niile unu na-arụ ọrụ. Ma a ga-emeghe ya nʼụbọchị izuike, na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
2Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị.
3Nʼihu ọnụ ụzọ ama ka ndị ala a ga-anọ fee Onyenwe anyị ofufe nʼụbọchị izuike na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
4Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ.
5Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya.