2Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị.
3Nʼihu ọnụ ụzọ ama ka ndị ala a ga-anọ fee Onyenwe anyị ofufe nʼụbọchị izuike na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
4Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ.
5Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya.
6Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla.