11Ma ebe apịtị ya niile, nʼebe niile mmiri na-adọ, agaghị adị ọhụrụ, ọ bụ nnu ga-aga ka a ga-ahapụrụ ebe ndị ahụ.
12Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”
13Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Nke a ga-abụ oke ala nke unu ga-eke nʼetiti ebo iri na abụọ nke Izrel dịka ihe nketa ha, Josef ga-enweta oke ala abụọ.
14Ebo ọbụla ga-eketa dịka ibe ya ketara, nʼihi na-eweliri m aka ṅụọ iyi na m ga-enye ndị nna nna unu ala ahụ, na ala a ga-aghọkwa ihe nketa unu.
15“Nke a ga-abụkwa oke ala nke ala unu ahụ. “Nʼakụkụ ugwu, ọ ga-esite nʼosimiri Mediterenịa nʼakụkụ ụzọ Hetlon, gafee Lebo gawa Zedad,