Izikiel 6

Ndị e gburu egbu ga-ada nʼetiti unu, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Ezekiel 6:7 (UKJV) And the slain shall fall in the midst of you, and all of you shall know that I am the LORD.

5Aga m atọgbọ ozu ndị Izrel nʼihu arụsị ha. Aga m aghasakwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụ aja unu.

6Ebe ọbụla unu bi, a ga-etikpọ obodo ndị ahụ, tipịakwa ebe ịchụ aja niile, si otu a mee ka ebe ịchụ aja unu ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu. A ga-etipịakwa arụsị unu, kụjiekwa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ihe niile unu ji aka unu mepụta ka a ga-ekpochapụkwa.

7Ndị e gburu egbu ga-ada nʼetiti unu, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

8“ ‘Ma aga m eme ka ụfọdụ nʼime ndị m fọdụ. Ndị ahụ fọdụrụ ga-esi nʼihu mma agha gbapụ, gbasasịa nʼala niile, na mba niile nke ụwa.

9Mgbe ha nọ dịka ndị a dọtara nʼagha na mba ọzọ, ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ga-echeta m. Ha ga-echeta otu ha si jiri obi nke ịkwa iko jupụtara nʼime ya, nke si nʼebe m nọ wezuga onwe ya, na anya nke na-agbaso arụsị ha, mee ka obi jọọ m njọ. Ha ga-akpọ onwe ha asị nʼihi ihe ọjọọ ndị ahụ ha mere, ya na ọchụchụ aja rụrụ arụ ha chụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.