3sị, ‘Unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị nye ugwu ukwu na ugwu nta niile, na iyi mmiri niile, na ndagwurugwu niile. Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, ga-eme ka agha bịakwasị unu, aga m ebibikwa ebe dị iche iche unu na-achụ aja.
4A ga-etikpọ ebe ịchụ aja unu, tipịa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Aga m atụsa ndị unu e gburu egbu nʼihu arụsị unu.
5Aga m atọgbọ ozu ndị Izrel nʼihu arụsị ha. Aga m aghasakwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụ aja unu.
6Ebe ọbụla unu bi, a ga-etikpọ obodo ndị ahụ, tipịakwa ebe ịchụ aja niile, si otu a mee ka ebe ịchụ aja unu ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu. A ga-etipịakwa arụsị unu, kụjiekwa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ihe niile unu ji aka unu mepụta ka a ga-ekpochapụkwa.
7Ndị e gburu egbu ga-ada nʼetiti unu, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.