11Ihe ike ebilitala, mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ. O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ, maọbụ igwe mmadụ maọbụ ụba ha, o nweghịkwa nke bara uru.
12Mgbe ahụ abịala! Ụbọchị ahụ abịakwala nso. Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ, nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile.
13Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi ngwa ahịa nke erere ere ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ. Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile bụ nke a na-apụghị ịgbanwe. Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha nke pụrụ ichebe ndụ ya.
14“ ‘Ha afụọla opi ike, ha edoziela ihe niile ma o nweghị onye ga-aga ibu agha nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile.
15Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.