7Oke nsogbu abịakwasịla gị, gị onwe gị bi nʼala ahụ. Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso! Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile.
8Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile. Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile.
9Agaghị m emere gị ebere, agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ. Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu. “ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a.
10“ ‘Lee, ụbọchị ahụ! Lee, ka ọ na-abịa! Oke nsogbu enupụtala, mkpanaka agbala okoko nganga amaala ifuru!
11Ihe ike ebilitala, mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ. O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ, maọbụ igwe mmadụ maọbụ ụba ha, o nweghịkwa nke bara uru.