Izikiel 8

Nʼafọ nke isii, nʼọnwa nke isii, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọdụ ala nʼụlọ m, ndị okenye Juda na-anọdụkwa ala nʼihu m, aka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ nʼebe ahụ.

Ezekiel 8:1 (UKJV) And it came to pass in the sixth year, in the sixth month, in the fifth day of the month, as I sat in mine house, and the elders of Judah sat before me, that the hand of the Lord GOD fell there upon me.

1Nʼafọ nke isii, nʼọnwa nke isii, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọdụ ala nʼụlọ m, ndị okenye Juda na-anọdụkwa ala nʼihu m, aka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ nʼebe ahụ.

2Ahụrụ m oyiyi yiri mmadụ. Akụkụ oyiyi a nke dị site nʼụkwụ ya ruo nʼala ya na-acha dịka ọkụ, sitekwanụ nʼụkwụ ya rigoo, ọ na-egbu nnọọ amụma dịka nkume amba dị oke ọnụahịa.

3Oyiyi a setịpụrụ ihe dịka aka mmadụ, jiri ya jide m nʼagịrị isi m. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu nʼetiti ala na mbara eluigwe. Nʼime ọhụ nke Chineke, o buuru m jee Jerusalem, nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼugwu, nʼime ogige ya, ebe arụsị ahụ na-akpasu ekworo guzo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.