3Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị.
4Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”
5Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya.
6Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.
7E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem.