Ezra 10

Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.

Ezra 10:6 (UKJV) Then Ezra rose up from before the house of God, and went into the chamber of Johanan the son of Eliashib: and when he came thither, he did eat no bread, nor drink water: for he mourned because of the transgression of them that had been carried away.

4Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”

5Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya.

6Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.

7E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem.

8Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.