Ezra 10

Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.

Ezra 10:8 (UKJV) And that whosoever would not come within three days, according to the counsel of the princes and the elders, all his substance should be forfeited, and himself separated from the congregation of those that had been carried away.

6Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.

7E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem.

8Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.

9Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ.

10Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.