Ezra 2

Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.

Ezra 2:62 (UKJV) These sought their register among those that were reckoned by genealogy, but they were not found: therefore were they, as polluted, put from the priesthood.

60Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ (652).

61Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha.

62Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.

63Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.

64Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360),

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.