Ezra 2

Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360),

Ezra 2:64 (UKJV) The whole congregation together was forty and two thousand three hundred and threescore,

62Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.

63Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.

64Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360),

65nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ (200).

66Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise (245).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.