63Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
64Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360),
65nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ (200).
66Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise (245).
67Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ (6,720).