1Ugbu a, ndị amụma, bụ Hegai, na Zekaraya nwa Ido buru amụma nye ndị Juu nọ na Juda nakwa Jerusalem. Ọ bụ nʼaha Chineke nke Izrel, onye na-achị ha ka ha buru amụma ahụ.
2Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak malitekwara iwu ụlọnsọ Chineke nʼJerusalem. Ndị amụma Chineke ahụ nọnyeere ha na-enyekwara ha aka.
3Ma Tatenai, onye na-achị mba niile dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndị enyi ha, gara Jerusalem jụọ ndị Juu sị; “Onye nyere unu ike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?”
4Ha jụkwara ha ajụjụ sị: “Gịnị bụ aha ndị na-arụ ụlọ a?”