Ezra 6

Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị.

Ezra 6:17 (UKJV) And offered at the dedication of this house of God an hundred bullocks, two hundred rams, four hundred lambs; and for a sin offering for all Israel, twelve he goats, according to the number of the tribes of Israel.

15Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs.

16Ụmụ Izrel, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị fọdụrụ nʼime ndị e mere ka ha ga biri nʼala ọzọ, ji ọṅụ mee mmemme nke ido ụlọ nke Chineke ahụ nsọ na gbaghee ya.

17Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị.

18Ha guzobere ndị nchụaja na nkewa ha, ndị Livayị nʼotu ha maka ije ozi nke Chineke na Jerusalem, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis.

19Ndị ahụ emere ka ha gaa biri nʼala ọzọ, mere Mmemme Ngabiga nʼabalị iri na anọ nke ọnwa mbụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.