Ezra 6

Unu egbochila owuwu ụlọ Chineke ahụ. Kwerenụ ka onyeisi ndị Juu na ndị okenye Juu wughachi ụlọ Chineke a nʼebe e wuru ya na mbụ.

Ezra 6:7 (UKJV) Let the work of this house of God alone; let the governor of the Jews and the elders of the Jews build this house of God in his place.

5Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke.

6Mgbe a gụsịrị ya, Daraiọs zighachiri Tatenai onye na-achị Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ nọ nʼọdịda anyanwụ Yufretis ozi sị ha, Unu hapụ ha ka ha rụọ ọrụ ha.

7Unu egbochila owuwu ụlọ Chineke ahụ. Kwerenụ ka onyeisi ndị Juu na ndị okenye Juu wughachi ụlọ Chineke a nʼebe e wuru ya na mbụ.

8Ọzọ, ana m enye iwu na nke a bụ ihe unu na-aghaghị imere ndị okenye, na ndị Juu niile na-ewugharị ụlọnsọ Chineke ahụ. Ka unu site nʼụtụ isi a na-atụrụ m kwụọ ụgwọ e ji ewu ụlọ ahụ na-atụfughị oge ọbụla.

9Unu nye ha ihe ọbụla dịkwa ha mkpa, ụmụ oke ehi na ebule, ụmụ atụrụ, ha ga-eji chụọrọ Chineke nke eluigwe aja. Nyekwanụ ha ọka wiiti, na mmanya, na nnu, na mmanụ oliv, dịka ndị nchụaja rịọrọ, bụ ndị nọ na Jerusalem, aghaghị inye ha ihe ndị a kwa ụbọchị niile na-esepụghị aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.