Ezra 8

Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị.

Ezra 8:23 (UKJV) So we fasted and besought our God for this: and he was implored of us.

21Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri Ahava, nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu Chineke anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị.

22Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na Chineke, onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ.

23Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị.

24Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ Izrel niile nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke anyị.

25Eji m ihe ọtụtụ tụọ onyinye ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze, na ndị ndụmọdụ ya, na ndịisi ozi ya, na ndị Izrel nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.