20Ha zitekwara narị abụọ na iri abụọ (220) site na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ. Otu nke Devid na ndịisi ya họpụtara hiwee, maka inyere ndị Livayị aka. E deturu aha ha niile nʼotu nʼotu.
21Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri Ahava, nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu Chineke anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị.
22Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na Chineke, onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ.
23Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị.
24Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ Izrel niile nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke anyị.