Ezra 9

nʼekpere sị, “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe.

Ezra 9:6 (UKJV) And said, O my God, I am ashamed and blush to lift up my face to you, my God: for our iniquities are increased over our head, and our trespass is grown up unto the heavens.

4Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị.

5Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo Onyenwe anyị Chineke m

6nʼekpere sị, “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe.

7Site nʼụbọchị nna nna anyị ha ruo taa, ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu. Nʼihi mmehie anyị, anyị na ndị eze anyị, na ndị nchụaja anyị ka enyefere nʼaka mma agha, na ndọta nʼagha, na ịpụnara anyị ihe nʼike na nweda nʼala nʼaka ndị eze ala mba ọzọ, dịka ọ dị taa.

8“Ma ugbu a, na nwa oge nta a, gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị egosila anyị amara, mee ka ole na ole fọdụrụ anyị. O nyeela anyị ọnọdụ siri ike nʼime ebe nsọ ya. Chineke anyị na-enye anya anyị ìhè, mee ka anyị kurutu ume ndụ nʼoge a site nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.