Ndị Galeshịa 1

Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a, Na-edegara nzukọ niile dị na Galeshịa.

Galatians 1:2 (UKJV) And all the brethren which are with me, unto the churches of Galatia:

1Pọl, onyeozi, na-abụghị site na nhọpụta nke mmadụ maọbụ site nʼike nke mmadụ, kama ọ bụ site nʼaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka ọ site nʼọnwụ bilie.

2Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a, Na-edegara nzukọ niile dị na Galeshịa.

3Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.

4Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.