1Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
2Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.
3Ụmụ ndị ikom Goma bụ: Ashkenaz, Rifat na Togama.
4Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim.
5(Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)