Jenesis 11

Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem. Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad.

Genesis 11:10 (UKJV) These are the generations of Shem: Shem was an hundred years old, and brings forth Arphaxad two years after the flood:

8Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ.

9Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.

10Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem. Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad.

11Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.

12Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.